Outline: Politishanụ gbagọrọ agbagọ na Politishanụ ziri ezi The English translation Meaning Usefulness Implications Politishanụ gbagọrọ agbagọ na Politishanụ ziri ezi M ga-ekerịta akwụkwọ ozi metụtara ma ụwa gị na nke m. Ọ bụghị sọsọ nke gị; Ọ dabere na ụwa ị si. M na-ekwu na "Onye ọ bụla amịkpurula." Ọ dịghị onye gbanarịrị mpu nke ndị ahụ Nigeria bụzị. Ọ ga-eju m anya ma ọ bụrụ na ị mataghị na ị bụ akụkụ nke nsogbu a maara dị ka Nigeria. Akwụkwọ ozi ndọrọ ndọrọ Nigeria, gosiri otu anyị si metọọ aka anyị n’ure nke n’osiri ike ịmata ọdịiche dị n'etiti ihe ruru alu n’ihe kwụ ọtọ. Lee ya ebe a: O nwere otu nwoke gbagọrọ agbagọ, ebiri n'ụlọ mgbagọrọ agbagọ. Ọ lụrụ nwunye gbagọrọ agbagọ, ma nweekwa ụmụaka gbagọrọ agbagọ. Ọ na-eyi uwe gbagọrọ agbagọ, ma na-asụ asụsụ gbagọrọ agbagọ. O nwere ụgbọ ala gbagọrọ agbagọ, n’agba n'okporo ụzọ gbagọrọ agbagọ. O biri ndụ gbagọrọ agbagọ, ma nwụọ ọnwụ gbagọrọ agbagọ. Ọ gbagọrọ n’ihe niile banyere ya. Onye a...
Mmụta, Nchọputa, Asụsụ, Mgbakọ na Wepu, Ochie na Ọhụrụ