Amaraefe mụrụ ụmụ n’eri, ụmụ iri n’otu. Ekpenta taba otu n’ime ha. Enyi nwoke Amaraefe batara n’ụlọ Amaraefe wee hụ ka osi n’ata ahụhụ. Ọdịghị ihe ọzọ mere n’abụghị-ịsị ya k’otufue nwa ya nwere ekpenta. Amaraefe onye di ya nwunarịrị ya ele anya n’elu na ala. Ọdịghị ebe ọzọ ọga-esi nweta enyemaka. Ọkpọlite nwa ya ahụ ekpenta n’ata k’oje tufuo ya n’abọ nkwụ. Anya mmiri malitere gbaba ụmụnne iri ndị ahụ zuru oke. Amaraefe n’onwe ya n’agbasi anya mmiri ike bodobodobodo. Enyi ya nwoke tufuo ihu ya. Ọchọghị ihu anya mmiri ndịa. Amaraefe mesịrị tufuo nwa ya n’abọ nkwụ. Kwa ụbọchi nwa ahụ atufuru atufu nọ n’akwa akwa n’agụkwazị egwu. Orue otu mgbe ụfọdụ ụmụnwanyị n’alọ ahịa; nwata a nwere ekpenta malitekwara n’agu egwu n’ebekwa akwa n’asị: Nnem nwanyị Amaraefe - njom njoroko Nnem nwanyị Amaraefe - njom njoroko Amaraefe mụrụ ụmụ iri - njom njoroko ụmụ iri n'otu - njom njoroko Ekpenta taba otu - njom njoroko Enyi ya nwoke abata - njom njoroko Ọsị ya tufege ya n'abọ - njom njoroko Ya tufe...
Mmụta, Nchọputa, Asụsụ, Mgbakọ na Wepu, Ochie na Ọhụrụ