Skip to main content

Igbo Poems

Onye Nkpụrụ Mmiri

E weta wii wii, Ị see.

E weta cocaine, Ị kuru.

E weta anwụrụ, Ị kpọọ.

E weta ahịhịa ukwu na nta, Ị tapịa.

 

E weta kaịkaị, Ị ñụọ.

E weta ngwọ, Ị rachaa.

E weta burukutu, Ị mịchaa.

E weta beer, Ị wụdaa.

 

Ị n’aga n’ụzọ, Ikuku a n’ebu gị.

Ị kwụrụ ọtọ, Ị n’ana ka ugwu mmanya.

Ị kwuo okwu, ọ bụrụ nyịkọrịkọtọ.

Ike gwu gị, Ị lahụ n’ọwa mmiri.

 

Ọ bụ ndu dị nkea?

Onye Nkpụrụ mmiri jiri ya na nwayọọ.

Ọ kwanụ onye rijuo afọ ọdachie ụzọ;

Mana afọ gị ye oye.

Ọ kwanụ onye kwụrụ ọtọ, akwatuo ya;

Mana egbe buru gị n’efegharị.

 

Ọma ọgọdu asa ahụ, mara onwe ya!

Ị chọrọ enyemaka? Kọtụrụ nwanne gị.

Ị chọrọ inwere onwe gị? Jụọ onye agbata obi gị.

Enyemaka nọ gị nso. Yọọ! Chọọ! iga-enwere onwe gị.

 

Ono mgbadụga! 

 

Ono mgbadụga!

Ino otu okpoko - wudụm

Ino okpoko abụụ - wudụm, wudụm.

Ino okpoko atọ - wudụm, wudụm, wudụm.

 

Olee ofe n'achị mgbadụga?

Ọ bụ egusi? Mba!

Ọ bụ ọgbọnọ? Mba!

Ọ bụ ede? Eye!

Ede na onigbu gbara ndụ n'isekwu.

 

Weta nkpụrụ achị,

Tinye ose, ya na mmanụ.

Weta azụ, tinye anụ, ya na nnu.

M'echefula, Ogiri. Ọ bụ ya bụ isi ofe.

 

Mgbadụga anatọka bụ mak'ihi ogiri.

Tinye okporoko, tinye echim, tinye nnu.

Ma hapụ ogiri, ofe gị g'atọ urọbụlụ, ụrọbụlụ.

 

Nwoke os'ite, nwanyị os'ite,

detue ya n'ahụ aja isiekwu gị.

Ogiri bụ isi ofe.

 



Popular posts from this blog

Echoes of Corruption: The Fall of Maazi Ebuka and the Triumph of Justice – A Nigerian Tale

Overview This Igbo drama, Ikuku Kuo Ahụ ike Okụkọ , authored by Stanley – Obilor Stella and published by God’s Eagle Publishers in 2017, centers around Maazi Ebuka, a wealthy man from Umuoma town. His wealth stemmed solely from the mass production and distribution of counterfeit medicines. Maazi Ebuka’s illicit activities continued unabated until his associates sold the fake medicines to a policewoman whose child was ill. Tragically, the adulterated medicine led to the child’s death. The policewoman, leveraging her influence and authority, swiftly sought justice. Maazi Ebuka and his accomplices were apprehended and subsequently sentenced to life imprisonment. While incarcerated, Maazi Ebuka’s son squandered his father’s fortune through a lavish lifestyle, depleting it within a few months.  A man in cuffs and two officers Outline for Writing About the Author’s Experiences: Preface: Incorporating Igbo Proverbs Public Perception Sourcing Genuine Medicines for Counterfeiting Devel...

A Person with Disability (Onye Ọrụsị) Vs (Onye Nkwarụ): Traditional and Cultural Mythological Model of Disability

Introduction Igbo has two terms that can be used to describe people with any types of disabilities:  blind, deaf, dumb, physical impairments, mental disorders, and cognitive disabilities. They often refer to them as (Ọrụsị) for some, and others may refer to them as (Nkwar ụ ). Both terms can refer to people with disabilities but the former (Ọrụsị) leans more on stereotypes than the latter (Nkwar ụ ). In this writing, there will be clear definitions between the two terms and at the end, a persona called Chikodi Nwajagu will be used to establish that a person with disabilities has rights to live independently, like everyone in the society and enjoin life as well as contribute to the society as much as possible. Also, following the arguments of the theoretical models of disability, this writing argues for a traditional and cultural mythological model of disability.  We will consider this outline: Onye Ọrụsị   (A person with disability) Social Exclusion Equation Explanati...

Akwụkwọ ozi ndọrọ ndọrọ Nigeria (or the Allegory of Nigerian Politics)

Outline: Politishanụ gbagọrọ agbagọ na Politishanụ ziri ezi The English translation Meaning Usefulness Implications Politishanụ gbagọrọ agbagọ na Politishanụ ziri ezi M ga-ekerịta akwụkwọ ozi metụtara ma ụwa gị na nke m. Ọ bụghị  sọsọ nke gị; Ọ dabere na ụwa ị si. M na-ekwu na "Onye ọ bụla amịkpurula." Ọ dịghị onye gbanarịrị mpu nke ndị ahụ Nigeria bụzị. Ọ ga-eju m anya ma ọ bụrụ na ị mataghị na ị bụ akụkụ nke nsogbu a maara dị ka Nigeria. Akwụkwọ ozi ndọrọ ndọrọ Nigeria, gosiri otu anyị si metọọ aka anyị n’ure nke n’osiri ike ịmata ọdịiche dị n'etiti ihe ruru alu n’ihe kwụ ọtọ. Lee ya ebe a: O nwere otu nwoke gbagọrọ agbagọ, ebiri n'ụlọ mgbagọrọ agbagọ. Ọ lụrụ nwunye gbagọrọ agbagọ, ma nweekwa ụmụaka gbagọrọ agbagọ. Ọ na-eyi uwe gbagọrọ agbagọ, ma na-asụ asụsụ gbagọrọ agbagọ. O nwere ụgbọ ala gbagọrọ agbagọ, n’agba n'okporo ụzọ gbagọrọ agbagọ. O biri ndụ gbagọrọ agbagọ, ma nwụọ ọnwụ gbagọrọ agbagọ. Ọ gbagọrọ n’ihe niile banyere ya.   Onye a...