Nke a bụ ilu ma bụrụkwa okwu n'ala Igbo. Ihe ọpụtara riri nne. Ị nwer'ike sụgharịa ya n'ụz'ọlemọle. Ọmụm'atụ ụfọdụ bụ: 'Nkwụcha abụrọ ụjọ.' 'Mberede nyịrị dike.' 'Eme ngwangwa emeghara ọdachi.' Okwu ndịa n'egosi ka ndi-Igbo si eche echiche. Nwoke m'ọbụ nwanyị bụ onye-Igbo ñụzụrụ ara anaghị eme ihe ọ bụla m'ọbụrụ n'ocheghi ya eche. Ya ga'eji asị n'ụmụ Igbo n'eji anya agb'ogige ebe ọ bụla ha nọ, ihe ọ bụla ha n'eme, nkata ọ bụla ha n'akpa. Makana onye n'ekwughi k'ọha, e buru ya bufee obi nna ya. Ọzọ dịka ibe ya wee bụrụ na-ijiji n'enweghi onye ndụmọdụ n'eso ozu aba n'ili. Iji kwu eziokwu, onwekwazịrị ndị enyere ezi ndụmọdụ ma ha jụrụ ịnara ya. Ajụjụ ị g'ajụ onwe gị taa bụ: abụ m ụkpana, k'abụ m ijiji? Lezienu anya, ka m kọrọ gị ihe ụkpana na ijiji mere. Ụkpana na Ijiji tiri n'aka k'amata onye nkpakpa ọga akpa g'aka emetụta ndị mmad...
Mmụta, Nchọputa, Asụsụ, Mgbakọ na Wepu, Ochie na Ọhụrụ